Jeremiah 6

Ndị iro agbaa Jerusalem gburugburu

1“Gbalaganụ unu ụmụ Benjamin!
Sitenụ na Jerusalem gbapụ!
Gbuonụ opi ike na Tekoa!
Bulienụ ihe ngosi elu na Bet-Hakerem!
Nʼihi na lee, ihe ọjọọ si nʼakụkụ ugwu na-abịa,
e, mbibi dị ukwuu na-abịa.
2Aga m ebibi ada Zayọn,
onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke.
3Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya.
Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya.
Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma.

4“Jikerenụ ibu agha megide ya!
Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie.
Ma lee, anyanwụ ebidola ịda,
onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya.
5Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị!
Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!”
6Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru,

“Gbutusienụ osisi niile,
wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem.
A ghaghị ịta obodo a ahụhụ,
nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya.
7Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta
otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta.
Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya;
ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.
8Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem,
ka m ghara ịgbakụta gị azụ,
mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.”
9Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

“Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma,
dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị;
werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile,
dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.”

10Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị?
Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu?
Ntị ha emechiela
ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla.
Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ;
nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.
11Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi,
apụghị m ịnagide ya nʼime m.

“Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ;
wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ.
Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ,
ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi.
12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ.
A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ,
Ee, ihe ndị a ga-emezu
mgbe m setịpụrụ aka m
megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
13“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,
ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.
Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja
na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
14Ha na-ekechi ọnya ndị m,
dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’
mgbe udo na-adịghị.
15O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere?
Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị.
Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere!
Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada.
Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
16Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,

“Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya.
Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ.
Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya.
Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike.
Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’
17Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị,
‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’
Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’
18Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile;
lezienụ anya, unu ndị akaebe niile,
ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha.
19Nụrụ, gị ụwa, lee,
ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi,
nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile,
nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m.
Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.
20Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme?
Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme?
Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile.
Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.”
21Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,

“Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe.
Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya;
otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”
22Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Lee, ndị agha si nʼala
dị nʼebe ugwu na-abịa;
mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa
site na nsọtụ niile nke ụwa.
23Ha ji ụta na ùbe,
ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere.
Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri,
dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha.
Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha,
ibuso gị agha, Ada Zayọn.”

24Anyị anụla akụkọ banyere ude ha,
ike agwụla aka anyị
Ya bụ, akụdawo
abụọ kpamkpam.
Oke ihe mgbu na-ejide anyị
dị ka nke nwanyị ime na-eme.
25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi,
maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ,
nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị,
egwu dịkwa nʼebe niile.
26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe.
Tụrụọnụ onwe unu na ntụ,
ruonụ uju, ma kwaanụ akwa,
dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara.
Nʼihi na onye mbibi ahụ
ga-abịakwasị anyị na mberede.

27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla,
ma ọla ahụ bụkwa ndị m.
Achọrọ m ka i nyochaa
ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.
28Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ,
ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha.
Ha bụ bronz na igwe;
ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi.
29Ngwa ọrụ ọkpụ uzu na-afụnwu ọkụ ike ike,
ime ka ọkụ rechapụ akụkụ igwe ahụ na-enweghị isi,
ma nnụcha ahụ na-aga nʼihu abaghị uru,
nʼihi na anụchapụghị ndị ajọ omume.
30Ọlaọcha a jụrụ ajụ ka akpọrọ ha,
nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ha.”
Copyright information for IboBIU